Got a Question? Drop Your Question Right >HERE< - Get an Immediate Response



Still Got a Question? Drop Your Question Right HERE 👇👇 and click on Search.Get an Immediate Response...



Join our FREE 2026 JAMB, WAEC, NECO and BECE Tutorial Classes here: Youtube

(Subscribe to the channel)



JSS 3 NECO BECE 2027 Questions and Answers Igbo Language

 

SECTION 1: AGỤCHAAZAA

GỤỌ AGỤCHAAZAA A MA ZAA AJỤJỤ NDỊ SỌ YA.

Nke a bụ akụkọ maka ahịa obodo m bụ Ugwụọba. Ugwụọba dị n’okpuru ọchịchị Oji River dị n’Enugu Steeti. Onye ọbụla si Enugu, Oji maọbụ Ọka pụta Ugwụọba ụbọchị Afọ ga-ahụ ndị na-aga ahịa. Ha na-ebu ngwaahịa ha dị iche iche na-achọ ụgbọala ga-ebuga ha Afọ Ugwụọba. Ebe ha ga-ere ma zụrụkwa ihe ndị ha chọrọ. Ahịa a na-azụ otu ụbọchị n’izu.

Afọ Ugwụọba dị n’etiti obodo niile dị n’Ugwụọba. Nke a mere ka ọ dịrị obodo niile nso. Ahịa ahụ na-adị ọcha oge niile. Onye ọbụla na-azachasi ọdụ ahịa ya tupu ọ kpọsa ihe ọ na-ere.

N’Afọ Ugwụọba, a na-ere ọtụtụ ihe na ya dika: ji, ji abana, ede, agwa, osikapa, akpụ, mmanụ, garị, ọka, unere, ogede, ube, akwụkwọ nri, akwa, akpụkpọụkwụ na ihe ndị ọzọ dị iche iche. Nke onye chọrọ, ọ gawa n’ọdụ ya gaa zụrụ ya.

Obodo dị iche iche na-azụ ahịa n’Afọ Ugwụọba n’ihi na ọ nọchiri ụzọ ma nwekwaa ezigbo okporouzo. Obodo ndị na-ere ma na-azụkwa ahịa na ya gụnyere: Ọka, Amansii, Achị, Inyi, Nkwere-Inyi, Doodo, Oji, Ojinaatọ dgz.

1. Aha obodo m bụ
A. Nike.
B. Oji.
C. Ọka.
D. Ọnịcha.
E. Ugwụọba.

2. Ahịa obodo m na-azụ ụbọchị
A. Afọ.
B. Eke.
C. Nkwọ.
D. Orie.
E. Ụka.

3. Ahịa ahụ dị n’______ obodo niile dị n’Ugwụọba.
A. akụkụ
B. azụ
C. elu
D. etiti
E. ihu

4. A na-erecha ihe ndị a n’ahịa ahụ ma e wepụ
A. agwa.
B. ede.
C. ji abana.
D. osikapa.
E. ụgbọala.

5. Kedu mgbe ahịa ahụ jị azụ?
A. Kwa ụbọchị n’izu
B. Otu ụbọchị n’izu
C. Ụbọchị abụọ n’izu
D. Ụbọchị anọ n’izu
E. Ụbọchị atọ n’izu

6. Ahịa a na-ekwụ maka ya dị na Steeti
A. Abịa.
B. Anambara.
C. Ebonyi.
D. Enugu.
E. Imo.

7. Onye ọbụla na-______ tupu ọ kpọsa ahịa ya.
A. azachasi ọdụ ahịa ya
B. egosi ihe ọ ga-ere ụbọchị ahụ
C. ekpe ekpere n’ahịa
D. ere ngwa ahịa ụfọdụ
E. ericha nri o jiri bịa ahịa

8. Obodo ndị a niile na-azụ ahịa a ma e wepụ
A. Achị.
B. Amansii.
C. Nsụka.
D. Ojinaatọ.
E. Ọka.

9. Kedu aha dabara adaba inye akụkọ a?
A. Aha obodo m
B. Ahịa obodo m
C. Ihe a na-ere n’ahịa obodo m
D. Ndị na-azụ ahịa obodo m
E. Ụbọchị ahịa obodo m

10. Okpuru ọchịchị ahịa a dị na ya bụ
A. Eziagu.
B. Oji River.
C. Ọka.
D. Udi River.
E. Ugwụọba.

SECTION II: MKPARỊTAỤKA

GỤỌ MKPARỊTAỤKA A MA ZAA AJỤJỤ NDỊ SỌ YA.

Ugobueze: Nna anyị, ụtụtụ ọma oo.
Maazị Ike: Eeehee!!!… Ugobueze nwunye m bjakenerịị.
Ugobueze: Oo nna anyị, ka m sapụ ihu ụtụtụ bja.
Maazị Ike: Eeehee!!!… Ugobueze, gịnị ka aga-eme Udochukwu nwetachara akwụkwọ ule NECO ya?
Ugobueze: Ana m eche ma ọ ga-agụ maka dibịa oyibo ma ọ bụrụ na o mee nke ọma n’ule JAMB ya.
Maazị Ike: Ihe i kwuru mara mma kama mụ onwe m chọrọ ka ọ gụọ maka ịrụọgwụ na ịkụọgwụ.
Ugobueze: Mba, achọrọ m ka ọ bụrụ dibịa oyibo n’ihi na ha bụzi ndị na-ebute ego ebute ugbu a.
Maazị Ike: Mba, ọ bụrụ na ọ gụọ maka ịrụọgwụ na ịkụọgwụ, ị mara na ihe adịrịla anyị mma, n’ihi na ahịa ọgwụ na-enye ezigbo ego ugbu a.
Ugobueze: Mba nna anyị, ọ bụrụ na o mepee ụlọọgwụ nke ya, ọ ga-enwe nnukwu ego, ihe adịrị anyị mma, ma nyekwara anyị aka n’ịzụ ụmụnne ya.

Maazị Ike: Ihe m maara bụna onye ọbụla gụrụ maka ịrụọgwụ ma na-erekwa ọgwụ na-enwe ego nke ukwuu. Ị gaa n’ebe a na-ere ọgwụ n’Ọnịcha, ị hụ ka ndịahịa ọgwụ na-eku ego ka mmiri.
Ugobueze: Ngwa ka anyị kpọọ Udochukwu mara ihe ọ chọrọ ịgụ na Mahadum Nsụka.
Maazị Ike: Oo!! Udochukwu, gịnị ka ị chọrọ ịgụ na mahadum?
Udochukwu: Achọrọ m ịgụ maka ịrụọgwụ n’ihi na a maara m ụfọdụ ihe banyere ya.
Ugobueze: Oo!! nnaa, ka Chukwu onye na-enye amamihe mezuere gị ka i si chọọ.
Maazị Ike: Ọ ka mma ka i siri jiri aka gị kwuo ihe ị ga-agụ na mahadum. Ka Olisa gọzie ma gbaa gị ume.

11. Mmadụ ole kparịtara ụka a?
A. Abụọ
B. Anọ
C. Atọ
D. Ise
E. Otu

12. Gịnị ka nwa ha nwoke sịrị na ọ chọrọ ịgụ na mahadum? Maka
A. dibịa oyibo
B. ịbụ ọkaikpe
C. ịbụ ụkọchukwu ụka
D. ịkụzi nkụzi
E. ịrụ na ịkụọgwụ

13. Aha nne Udochukwu bụ
A. Ifechi.
B. Ike.
C. Ọbjageri.
D. Udochukwu.
E. Ugobueze.

14. Ezinaụlọ a nwere mkparịtaụka a n’
A. abalị.
B. etiti ehihie.
C. ime abalị.
D. uhuruchi.
E. ụtụtụ.

15. Maazị Ike sịrị na ezigbo ego dị n’ahịa
A. akwa.
B. azụ.
C. mmanụ.
D. nri.
E. ọgwụ.

16. Nne Udochukwu sịrị na nwa ya ga-agụ maka ịbụ dibịa oyibo na Mahadum
A. Abịa.
B. Ebonyi.
C. Enugu.
D. Imo.
E. Nsụka.

17. Ndị na-eku ego ka mmiri na mkparịtaụka a bụ ndị
A. ahịa ọgwụ.
B. dibịa oyibo.
C. ọkwọ ụgbọala.
D. ọrụ nkụzi.
E. ọrụ oyibo.

18. Ugobueze sịrị na Udochukwu ga-enyere ha aka zụọ
A. nna ya.
B. nne ya.
C. ụmụada ya.
D. ụmụnna ya.
E. ụmụnne ya.

19. Ọ ka mma ka i siri jiri aka gị kwuo ihe ị ga-agụ na mahadum.
Onye kwuru okwu a na mkparịtaụka a?
A. Dibịa oyibo
B. Maazị Ike
C. Ndị ahịa
D. Udochukwu
E. Ugobueze

20. Ndị na-ere ọgwụ na-eku ego ka mmiri n’ahịa
A. Aba.
B. Owere.
C. Ọlụ.
D. Ọnịcha.
E. Ụmụọji.

SECTION III: ỌNỤỌGỤGỤ (NUMERALS)

21. How do we write 60 in Igbo?
A. Iri isii
B. Iri isii na isii
C. Iri na isii
D. Narị isii
E. Puku isii

22. “12” pụtara gịnị n’asụsụ Igbo?
A. Abụọ
B. Iri abụọ
C. Iri abụọ na abụọ
D. Iri na abụọ
E. Narị abụọ

23. “Iri atọ na atọ” pụtara gịnị na Bekee?
A. Thirteen
B. Thirty
C. Thirty one
D. Thirty three
E. Thirty two

GREETINGS

24. Good morning n’asụsụ Igbo pụtara
A. ehihie ọma.
B. ka chi bọọ.
C. ka chi foo.
D. uhuruchi ọma.
E. ụtụtụ ọma.

25. Onye a na-ekele ndo bụ onye
A. mụrụ nwa ọhụrụ.
B. na-agụ egwu.
C. na-arịa ọrịa.
D. na-eme njem.
E. na-eri nri.

26. Gịnị ka a na-ekele onye meere mmadụ ihe ọma?
A. I meela, ndeewo.
B. Ị bụ ajọ mmadụ.
C. Jee zue ike, ị maghị ihe.
D. Onye afọ njọ.
E. Pụọ m n’anya.

ABỤCHỊỊ IGBO (ALPHABETS)

27. Ụdaume dị ole n’asụsụ Igbo?
A. Anọ
B. Asaa
C. Asatọ
D. Ise
E. Isii

28. Mgbochiume e nwere n’Igbo dị iri
A. abụọ na asatọ.
B. asaa na abụọ.
C. asatọ na atọ.
D. isii na otu.
E. ịtoolu na anọ.

29. Ole ka mgbochiume mkpị Igbo dị?
A. Asaa
B. Asatọ
C. Iri
D. Isii
E. Ịtoolu

30. Nke enweghị myiriụdaume ebe a bụ
A. maranụ.
B. mmadụ.
C. mmanụ.
D. ngara.
E. nkịta.

31. Ọgbara nke bụ naanị mgbochiume mkpị na ndị a bụ
A. ch d f g.
B. ch d f j.
C. ch gb h j.
D. ch gb gh gw.
E. ch gh gw h.

NTỤGHARỊ (TRANSLATION)

32. How do you say “I am coming” in Igbo?
A. Abịala m.
B. Abịara m.
C. Abịarụọla m.
D. Ana m abịa.
E. Anaghị m abịa.

33. What is crocodile in Igbo?
A. Agụ
B. Agụiyi
C. Enyi
D. Mbe
E. Ọdụm

34. I am cooking now.
A. Aga m esi nri ugbua.
B. Ana m esi nri ugbua.
C. Anyị na-esi nri ugbua.
D. Gaa sie nri ugbua.
E. Ọ na-esi nri ugbua.

35. Mbụrụ pụtara gịnị na Bekee?
A. Irony
B. Metaphor
C. Personification
D. Proverb
E. Simile

ASỤSỤ (GRAMMAR)

36. Nkejiokwu ole dị n’okwu a bụ “ogologo”?
A. Anọ
B. Asaa
C. Asatọ
D. Ise
E. Isii

37. Mejuo ahịrịokwu a: Ome mma na-emere…
A. nna ya.
B. nne ya.
C. onwe ya.
D. ụmụnna ya.
E. ụmụnne ya.

38. Ha bụ ụmụakwụkwọ Mahadum Enugu Steeti.
Okwu a kara ihe n’okpuru bụ
A. aha.
B. ngwaa.
C. nkọwaaha.
D. nkwuwa.
E. nọọchiaha.

39. Olee nke abụghị olundị na ndị a?
A. Aha
B. Anị
C. Efi
D. Ekwa
E. Enya

40. Họpụta nke ụdaolu ya pụtara oke (male).
A. Óké
B. Ókè
C. Òkè
D. Òké
E. Ókē

OMENAALA NA EWUMEWU

41. Otu na ndị a bụ omenaala Igbo.
A. Iku nwa
B. Iri ji ọhụrụ
C. Ịga ozi
D. Ịga ọrụ
E. Ịsa akwa

42. Ndị Igbo na-eji ndị a eme ọjị ma e wepụ
A. akụ ilu.
B. aṅara.
C. mmanụ.
D. ose ọjị.
E. ọjị.

43. Nwaanyị anaghị eme otu na ndị a.
A. Iku nwa ya
B. Inye nwa ya ara
C. Isi nri n’ezinaụlọ
D. Ịmụ nwa
E. Ịrị elu nkwụ

44. Asụsụ e ji awa ọjị bụ asụsụ
A. Efik.
B. Hausa.
C. Igala.
D. Igbo.
E. Yoruba.

45. Ọjị gbara ibe ise bụ ọjị
A. ahịa anọ.
B. dike.
C. ikenga.
D. ogbi.
E. ọmụmụ na ụba.

PICTORIALS

46. Gịnị na-akụ ebe a? Elekere
(Clock showing approximately 11:00)
A. asaa
B. asatọ
C. iri na abụọ
D. iri na otu
E. isii

47. Ihe na-akụ ebe a bụ elekere iri na
(Clock showing approximately 12:00 / 1:00)
A. abụọ.
B. atọ.
C. ise.
D. isii.
E. otu.

48. N’esereese a, olee ebe aka onye nke mbụ dị? N’
(Image of four boys standing in a row)
A. afọ ya
B. akpa ya
C. isi ya
D. obi ya
E. ọnụ ya

49. Kedu aha esereese a?
(Image of an open hand / palm)
A. Aka
B. Anya
C. Eze
D. Isi
E. Ntị

50. Ndị nọ n’esereese a na-
(Image of two boys playing football)
A. agụ akwụkwọ.
B. agba bọọlụ.
C. agba egwu.
D. asụ akpụ.
E. awụli elu.

51. Kedu ihe nkịta nọ n’esereese a na-eme? Ọ
(Image of a dog)
A. ga-ata ọkpụkpụ.
B. na-ata ọkpụkpụ.
C. taala ọkpụkpụ.
D. tara ọkpụkpụ.
E. chọrọ ịta ọkpụkpụ.

52. Aha esereese a bụ
(Image of a bird on a branch)
A. egbe.
B. nnụnụ.
C. ọbagwụ.
D. ọkụkọ.
E. udele.

53. Họpụta aha esereese a.
(Image of a bunch of bananas)
A. Aṅara
B. Mangoro
C. Ogede
D. Oroma
E. Ụdara

54. Onye nọ n’esereese a na-eme gịnị? Ọ na-
(Image of a boy writing on a board)
A. adụ ihe.
B. akpụ ihe.
C. edozi ihe.
D. ehicha ihe.
E. ese ihe.

55. Kedu ihe dị n’esereese a?
(Image of a man washing/cleaning a car)
A. Agụ na ọdụm
B. Ewu na ọkụkọ
C. Mmadụ na ụgbọala
D. Mmadụ na ụlọ
E. Ụgbọala na enyi

56. Onye nọ n’esereese a na-
(Image of a woman sweeping)
A. asa akwa.
B. aza ihe.
C. ede ihe.
D. eri nri.
E. esi nri.

57. Olee ihe e ji esereese a eme?
(Image of an iron)
A. Adụ akwa
B. Asụ akwa
C. Ede akwa
D. Ego akwa
E. Ekwe akwa

58. Ebe a na-eyi esereese a bụ na/n’
(Image of a shoe)
A. afọ.
B. aka.
C. mbọ aka.
D. ntutu isi.
E. ụkwụ.

59. Olee aha esereese a?
(Image of a watering can)
A. Iko
B. Ite
C. Mgba mmiri
D. Mkpụrụ osisi
E. Odo

60. Kedu aha esereese a?
(Image of a radio / cassette player)
A. Igwe njuoyi
B. Igwe onyoonyoo
C. Mkpọọkụ
D. Ntụoyi
E. Osiite

 



Still Got a Question? Drop Your Question Right HERE 👇👇 and click on Search.Get an Immediate Response...




Get in touch with us

Join our FREE 2026 JAMB, WAEC, NECO and BECE Tutorial Classes here: Youtube (Subscribe to the channel)

This is for JSCE, Science and Art Students


If this post was helpful to you, please help us to reach others by sharing with the buttons below!

About Henry Divine

Henry Divine is a passionate educator and seasoned blogger with a strong commitment to providing valuable insights and resources to the education community.With over 6 years of experience in the field, Henry's articles are well-researched, authoritative, and tailored to meet the needs of teachers, students, and parents alike.Through his blog, Henry aims to empower readers with practical tips, innovative strategies, and evidence-based practices to foster lifelong learning and academic success.Follow Henry for the latest updates and expert advice on all things education.

Check Also

JSS 3 NECO BECE 2027 Questions and Answers French Language

This is for BECE Candidates looking for NECO BECE 2027 Questions and Answers French Language, …

JSS 3 NECO BECE 2027 Questions and Answers Mathematics

This is for BECE Candidates looking for NECO BECE 2027 Questions and Answers Mathematics, as …